Jeremaya 51:40
Jeremiah 51:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m akpụdata ha, dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka ebule na mkpi.
Jeremiah 51:40 in English
Jeremiah 51:40 · Berean Standard Bible
I will bring them down like lambs to the slaughter, like rams with male goats.
Context
38Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm,
ha na-emekwa ụzụ dịka ụmụ ọdụm na-aṅụ ara. 39Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha,
aga m edo oriri nʼihu ha.
Aga m eme ka ha ṅụbiga mmanya oke,
si otu a mee ka ha jiri oke ịchị ọchị tie mkpu ọṅụ.
Nʼikpeazụ, ha ga-arahụ ụra ebighị ebi, nke ha na-agaghị esite na ya bilie.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 40“Aga m akpụdata ha,
dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu,
dịka ebule na mkpi. 41“Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha,
jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha.
Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu
nʼetiti mba niile! 42Osimiri ga-eri Babilọn,
mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.