Native Bible

Jeremiah 51:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Osimiri ga-eri Babilọn, mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya.

Jeremiah 51:42 in English

Jeremiah 51:42 · Berean Standard Bible

The sea has come up over Babylon; she is covered in turbulent waves.

Context

40“Aga m akpụdata ha, dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka ebule na mkpi. 41“Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha, jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha. Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile! 42Osimiri ga-eri Babilọn, mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya. 43Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu, ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara, ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya, nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee. 44Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ, mee ya ka ọ gbọpụta ihe ndị ahụ o loro. Mba dị iche iche agakwaghị agakwurukwa ya ọzọ. Mgbidi Babilọn ga-adakwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.