Jeremaya 51:43
Jeremiah 51:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu, ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara, ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya, nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee.
Jeremiah 51:43 in English
Jeremiah 51:43 · Berean Standard Bible
Her cities have become a desolation, a dry and arid land, a land where no one lives, where no son of man passes through.
Context
41“Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha,
jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha.
Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu
nʼetiti mba niile! 42Osimiri ga-eri Babilọn,
mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya. 43Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu,
ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara,
ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya,
nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee. 44Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ,
mee ya ka ọ gbọpụta ihe ndị ahụ o loro.
Mba dị iche iche agakwaghị agakwurukwa ya ọzọ.
Mgbidi Babilọn ga-adakwa. 45“Sinụ nʼime ya pụta, unu ndị m!
Gbapụnụ ọsọ nʼihi ndụ unu.
Gbapụnụ ọsọ site nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.