Jeremaya 51:44
Jeremiah 51:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ, mee ya ka ọ gbọpụta ihe ndị ahụ o loro. Mba dị iche iche agakwaghị agakwurukwa ya ọzọ. Mgbidi Babilọn ga-adakwa.
Jeremiah 51:44 in English
Jeremiah 51:44 · Berean Standard Bible
I will punish Bel in Babylon. I will make him spew out what he swallowed. The nations will no longer stream to him; even the wall of Babylon will fall.
Context
42Osimiri ga-eri Babilọn,
mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya. 43Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu,
ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara,
ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya,
nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee. 44Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ,
mee ya ka ọ gbọpụta ihe ndị ahụ o loro.
Mba dị iche iche agakwaghị agakwurukwa ya ọzọ.
Mgbidi Babilọn ga-adakwa. 45“Sinụ nʼime ya pụta, unu ndị m!
Gbapụnụ ọsọ nʼihi ndụ unu.
Gbapụnụ ọsọ site nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị. 46Unu adala mba, unu atụkwala ụjọ,
mgbe unu nụrụ akụkọ dị iche iche nʼala ahụ.
Nʼihi na otu ụdị akụkọ ka a ga-anụ nʼafọ a, akụkọ ọzọ dị iche ka a ga-anụkwa nʼafọ nke ọzọ.
A ga-anụ akụkọ iwusi ọbara nʼala ahụ,
nụkwa akụkọ onye ọchịchị nke na-ebuso onye ọchịchị ọzọ agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.