Jeremaya 51:41
Jeremiah 51:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha, jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha. Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile!
Jeremiah 51:41 in English
Jeremiah 51:41 · Berean Standard Bible
How Sheshach * has been captured! The praise of all the earth has been seized. What a horror Babylon has become among the nations!
Context
39Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha,
aga m edo oriri nʼihu ha.
Aga m eme ka ha ṅụbiga mmanya oke,
si otu a mee ka ha jiri oke ịchị ọchị tie mkpu ọṅụ.
Nʼikpeazụ, ha ga-arahụ ụra ebighị ebi, nke ha na-agaghị esite na ya bilie.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 40“Aga m akpụdata ha,
dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu,
dịka ebule na mkpi. 41“Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha,
jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha.
Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu
nʼetiti mba niile! 42Osimiri ga-eri Babilọn,
mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya. 43Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu,
ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara,
ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya,
nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.