Jeremaya 51:33
Jeremiah 51:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ada Babilọn dịka ebe ịzọcha ọka, nʼoge a na-azọcha ya. Mgbe a ga-ewe ya dịka e si ewe ihe ubi na-abịa nso.”
Jeremiah 51:33 in English
Jeremiah 51:33 · Berean Standard Bible
For this is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: “The Daughter of Babylon is like a threshing floor at the time it is trampled. In just a little while her harvest time will come.”
Context
31Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya,
otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ;
ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya
na a dọtala obodo ya nʼagha, 32na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi,
na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ,
na ndị agha niile na-amakwa jijiji.” 33Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,
“Ada Babilọn dịka ebe ịzọcha ọka,
nʼoge a na-azọcha ya.
Mgbe a ga-ewe ya dịka e si ewe ihe ubi na-abịa nso.” 34“Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị,
o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya.
O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya.
O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ,
jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya.
Emesịa, ọ gbọpụtara anyị. 35Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.”
Ọ bụ ihe ndị bi na Zayọn kwuru.
Jerusalem na-ekwukwa sị,
“Ka ọbara anyị dịkwa nʼisi ndị bi na Babilọn.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.