Jeremaya 51:10
Jeremiah 51:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè. Ka anyị kwupụta ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’
Jeremiah 51:10 in English
Jeremiah 51:10 · Berean Standard Bible
“The LORD has brought forth our vindication; come, let us tell in Zion what the LORD our God has accomplished.”
Context
8Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya.
Kwasierenụ ya akwa ike.
Wetanụ ọgwụ tee ya,
ma eleghị anya ọnya ahụ ga-adị ya mma. 9“ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn,
ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta.
Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị,
nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe.
Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’ 10“ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè.
Ka anyị kwupụta
ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’ 11“Mụọnụ ọnụ àkụ unu;
bulienụ ọta unu!
Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia,
nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi.
Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ,
ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ. 12Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn.
Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne
Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya.
Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo,
bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.