Jeremaya 51:11
Jeremiah 51:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mụọnụ ọnụ àkụ unu; bulienụ ọta unu! Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia, nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi. Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ, ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ.
Jeremiah 51:11 in English
Jeremiah 51:11 · Berean Standard Bible
Sharpen the arrows! Fill the quivers!* The LORD has aroused the spirit of the kings of the Medes, because His plan is aimed at Babylon to destroy her, for it is the vengeance of the LORD— vengeance for His temple.
Context
9“ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn,
ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta.
Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị,
nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe.
Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’ 10“ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè.
Ka anyị kwupụta
ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’ 11“Mụọnụ ọnụ àkụ unu;
bulienụ ọta unu!
Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia,
nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi.
Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ,
ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ. 12Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn.
Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne
Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya.
Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo,
bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn. 13Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri,
ndị nwere akụnụba dị ukwuu,
ọgwụgwụ unu abịaruola.
Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.