Jeremaya 51:13
Jeremiah 51:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ndị nwere akụnụba dị ukwuu, ọgwụgwụ unu abịaruola. Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu.
Jeremiah 51:13 in English
Jeremiah 51:13 · Berean Standard Bible
You who dwell by many waters, rich in treasures, your end has come; the thread of your life is cut.
Context
11“Mụọnụ ọnụ àkụ unu;
bulienụ ọta unu!
Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia,
nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi.
Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ,
ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ. 12Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn.
Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne
Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya.
Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo,
bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn. 13Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri,
ndị nwere akụnụba dị ukwuu,
ọgwụgwụ unu abịaruola.
Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu. 14Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị,
Nʼezie, aga m eme ka ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ga-aha ka igurube jupụta nʼime gị.
Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ megide gị. 15“O sitere nʼike ya mee ụwa;
ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya,
ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.