Jeremaya 51:15
Jeremiah 51:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“O sitere nʼike ya mee ụwa; ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
Jeremiah 51:15 in English
Jeremiah 51:15 · Berean Standard Bible
The LORD made the earth by His power; He established the world by His wisdom and stretched out the heavens by His understanding.
Context
13Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri,
ndị nwere akụnụba dị ukwuu,
ọgwụgwụ unu abịaruola.
Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu. 14Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị,
Nʼezie, aga m eme ka ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ga-aha ka igurube jupụta nʼime gị.
Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ megide gị. 15“O sitere nʼike ya mee ụwa;
ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya,
ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile. 16Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.
Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie.
Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo,
na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya na-ewepụta ifufe. 17“Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.
Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ.
Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ;
ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.