Native Bible

Jeremiah 51:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn. Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya. Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha, nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo, bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn.

Jeremiah 51:12 in English

Jeremiah 51:12 · Berean Standard Bible

Raise a banner against the walls of Babylon; post the guard; station the watchmen; prepare the ambush. For the LORD has both devised and accomplished what He spoke against the people of Babylon.

Context

10“ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè. Ka anyị kwupụta ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’ 11“Mụọnụ ọnụ àkụ unu; bulienụ ọta unu! Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia, nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi. Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ, ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ. 12Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn. Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya. Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha, nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo, bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn. 13Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ndị nwere akụnụba dị ukwuu, ọgwụgwụ unu abịaruola. Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu. 14Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị, Nʼezie, aga m eme ka ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ga-aha ka igurube jupụta nʼime gị. Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ megide gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.