Jeremaya 51:9
Jeremiah 51:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn, ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta. Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị, nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe. Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’
Jeremiah 51:9 in English
Jeremiah 51:9 · Berean Standard Bible
“We tried to heal Babylon, but she could not be healed. Abandon her! Let each of us go to his own land, for her judgment extends to the sky and reaches to the clouds.”
Context
7Babilọn dị ka iko ọlaedo nʼaka Onyenwe anyị.
O mere ka ụwa niile si nʼiko ahụ ṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke.
Mba niile nke ụwa ṅụrụ mmanya ya.
Ugbu a ha niile na-ayị ara. 8Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya.
Kwasierenụ ya akwa ike.
Wetanụ ọgwụ tee ya,
ma eleghị anya ọnya ahụ ga-adị ya mma. 9“ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn,
ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta.
Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị,
nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe.
Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’ 10“ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè.
Ka anyị kwupụta
ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’ 11“Mụọnụ ọnụ àkụ unu;
bulienụ ọta unu!
Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia,
nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi.
Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ,
ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.