Jeremaya 51:8
Jeremiah 51:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya. Kwasierenụ ya akwa ike. Wetanụ ọgwụ tee ya, ma eleghị anya ọnya ahụ ga-adị ya mma.
Jeremiah 51:8 in English
Jeremiah 51:8 · Berean Standard Bible
Suddenly Babylon has fallen and been shattered. Wail for her; get her balm for her pain; perhaps she can be healed.
Context
6“Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ.
Gbasienụ ọsọ ike nʼihi ndụ unu.
Unu ekwela ka e bibie unu nʼihi mmehie ya.
Oge ịbọ ọbọ Onyenwe anyị eruola,
ọ ga-akwụghachi ya ihe ruuru ya. 7Babilọn dị ka iko ọlaedo nʼaka Onyenwe anyị.
O mere ka ụwa niile si nʼiko ahụ ṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke.
Mba niile nke ụwa ṅụrụ mmanya ya.
Ugbu a ha niile na-ayị ara. 8Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya.
Kwasierenụ ya akwa ike.
Wetanụ ọgwụ tee ya,
ma eleghị anya ọnya ahụ ga-adị ya mma. 9“ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn,
ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta.
Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị,
nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe.
Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’ 10“ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè.
Ka anyị kwupụta
ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.