Jeremaya 50:14
Jeremiah 50:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn, unu ndị niile na-agba ụta. Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụ nʼihi na o mehiela megide Onyenwe anyị.
Jeremiah 50:14 in English
Jeremiah 50:14 · Berean Standard Bible
Line up in formation around Babylon, all you who draw the bow! Shoot at her! Spare no arrows! For she has sinned against the LORD.
Context
12Ihere ga-eme nne unu,
e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu.
Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile,
bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu. 13Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ,
nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam.
Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya.
Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ. 14“Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn,
unu ndị niile na-agba ụta.
Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụ
nʼihi na o mehiela megide Onyenwe anyị. 15Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile!
Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala,
a kwatuokwala mgbidi ya niile.
Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn,
bọọnụ ya ọbọ.
Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ. 16Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ
na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi.
Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya,
ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya,
nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.