Jeremaya 50:13
Jeremiah 50:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ, nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam. Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya. Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ.
Jeremiah 50:13 in English
Jeremiah 50:13 · Berean Standard Bible
Because of the wrath of the LORD, she will not be inhabited; she will become completely desolate. All who pass through Babylon will be horrified and will hiss at all her wounds.
Context
11“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ,
gị onye bibiri ihe nketa m,
ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka,
bee akwa dịka oke ịnyịnya. 12Ihere ga-eme nne unu,
e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu.
Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile,
bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu. 13Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ,
nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam.
Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya.
Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ. 14“Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn,
unu ndị niile na-agba ụta.
Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụ
nʼihi na o mehiela megide Onyenwe anyị. 15Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile!
Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala,
a kwatuokwala mgbidi ya niile.
Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn,
bọọnụ ya ọbọ.
Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.