Jeremaya 50:12
Jeremiah 50:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihere ga-eme nne unu, e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu. Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile, bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu.
Jeremiah 50:12 in English
Jeremiah 50:12 · Berean Standard Bible
your mother will be greatly ashamed; she who bore you will be disgraced. Behold, she will be the least of the nations, a wilderness, a dry land, and a desert.
Context
10Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha.
Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 11“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ,
gị onye bibiri ihe nketa m,
ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka,
bee akwa dịka oke ịnyịnya. 12Ihere ga-eme nne unu,
e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu.
Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile,
bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu. 13Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ,
nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam.
Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya.
Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ. 14“Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn,
unu ndị niile na-agba ụta.
Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụ
nʼihi na o mehiela megide Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.