Native Bible

Jeremiah 50:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha. Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Jeremiah 50:10 in English

Jeremiah 50:10 · Berean Standard Bible

Chaldea * will be plundered; all who plunder her will have their fill,” declares the LORD.

Context

8“Sinụ na Babilọn gbalaga; sitekwanụ nʼala Babilọn pụọ, dịrịnụ ka mkpi na-edu igwe ewu na atụrụ. 9Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu, ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha. Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya; ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha. Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba. Ha agaghị agba aka lọta. 10Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha. Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 11“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ, gị onye bibiri ihe nketa m, ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka, bee akwa dịka oke ịnyịnya. 12Ihere ga-eme nne unu, e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu. Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile, bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.