Jeremaya 50:10
Jeremiah 50:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha. Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 50:10 in English
Jeremiah 50:10 · Berean Standard Bible
Chaldea * will be plundered; all who plunder her will have their fill,” declares the LORD.
Context
8“Sinụ na Babilọn gbalaga;
sitekwanụ nʼala Babilọn pụọ,
dịrịnụ ka mkpi na-edu igwe ewu na atụrụ. 9Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu,
ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha.
Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya;
ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha.
Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba.
Ha agaghị agba aka lọta. 10Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha.
Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 11“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ,
gị onye bibiri ihe nketa m,
ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka,
bee akwa dịka oke ịnyịnya. 12Ihere ga-eme nne unu,
e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu.
Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile,
bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.