Native Bible

Jeremiah 50:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu, ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha. Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya; ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha. Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba. Ha agaghị agba aka lọta.

Jeremiah 50:9 in English

Jeremiah 50:9 · Berean Standard Bible

For behold, I stir up and bring against Babylon an assembly of great nations from the land of the north. They will line up against her; from the north she will be captured. Their arrows will be like skilled warriors who do not return empty-handed.

Context

7Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha. Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha, na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’ 8“Sinụ na Babilọn gbalaga; sitekwanụ nʼala Babilọn pụọ, dịrịnụ ka mkpi na-edu igwe ewu na atụrụ. 9Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu, ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha. Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya; ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha. Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba. Ha agaghị agba aka lọta. 10Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha. Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 11“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ, gị onye bibiri ihe nketa m, ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka, bee akwa dịka oke ịnyịnya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.