Jeremaya 50:7
Jeremiah 50:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha. Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha, na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’
Jeremiah 50:7 in English
Jeremiah 50:7 · Berean Standard Bible
All who found them devoured them, and their enemies said, ‘We are not guilty, for they have sinned against the LORD, their true pasture, the LORD, the hope of their fathers.’
Context
5Ha ga-ajụ ajụjụ, banyere ụzọ e si eje Zayọn.
Mgbe ahụ, ha ga-eche ihu ha ijeru nʼebe ahụ.
Ha niile ga-abịakwa were onwe ha nyefee* nʼaka Onyenwe anyị,
nʼime ọgbụgba ndụ ebighị ebi,
nke a na-agaghị echefu echefu. 6“Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu.
Ndị ọzụzụ atụrụ ha eduhiela ha,
mee ka ha na-awagharị nʼugwu ukwu niile.
Ha na-akpagharị nʼelu ugwu ukwu, ma nʼelu ugwu nta.
Ha echefuokwala ebe izuike nke ha. 7Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha.
Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị
nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha,
na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’ 8“Sinụ na Babilọn gbalaga;
sitekwanụ nʼala Babilọn pụọ,
dịrịnụ ka mkpi na-edu igwe ewu na atụrụ. 9Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu,
ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha.
Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya;
ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha.
Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba.
Ha agaghị agba aka lọta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.