Native Bible

Jeremiah 50:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu. Ndị ọzụzụ atụrụ ha eduhiela ha, mee ka ha na-awagharị nʼugwu ukwu niile. Ha na-akpagharị nʼelu ugwu ukwu, ma nʼelu ugwu nta. Ha echefuokwala ebe izuike nke ha.

Jeremiah 50:6 in English

Jeremiah 50:6 · Berean Standard Bible

My people are lost sheep; their shepherds have led them astray, causing them to roam the mountains. They have wandered from mountain to hill; they have forgotten their resting place.

Context

4“Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ndị Izrel na ndị Juda ga-ejikọta onwe ha nʼotu. Ha niile ga-eji anya mmiri pụọ ịchọ Onyenwe anyị Chineke ha. 5Ha ga-ajụ ajụjụ, banyere ụzọ e si eje Zayọn. Mgbe ahụ, ha ga-eche ihu ha ijeru nʼebe ahụ. Ha niile ga-abịakwa were onwe ha nyefee* nʼaka Onyenwe anyị, nʼime ọgbụgba ndụ ebighị ebi, nke a na-agaghị echefu echefu. 6“Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu. Ndị ọzụzụ atụrụ ha eduhiela ha, mee ka ha na-awagharị nʼugwu ukwu niile. Ha na-akpagharị nʼelu ugwu ukwu, ma nʼelu ugwu nta. Ha echefuokwala ebe izuike nke ha. 7Nʼihi ya, ndị niile chọtara ha na-eripịa ha. Ndị iro ha na-ekwukwa sị, ‘Ikpe amaghị anyị nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị, onye bụ ezi ebe ịta nri ha, na onye bụkwa olileanya nke nna nna ha.’ 8“Sinụ na Babilọn gbalaga; sitekwanụ nʼala Babilọn pụọ, dịrịnụ ka mkpi na-edu igwe ewu na atụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.