Jeremaya 50:4
Jeremiah 50:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ndị Izrel na ndị Juda ga-ejikọta onwe ha nʼotu. Ha niile ga-eji anya mmiri pụọ ịchọ Onyenwe anyị Chineke ha.
Jeremiah 50:4 in English
Jeremiah 50:4 · Berean Standard Bible
“In those days and at that time, declares the LORD, the children of Israel and the children of Judah will come together, weeping as they come, and will seek the LORD their God.
Context
2“Kwusaa ya na mba niile, mee ka a nụrụ ya;
bulie ọkọlọtọ mgbe a na-ekwusa ya.
Kwupụta ihe niile, ezokwala ihe ọbụla, kama kwusaa ya sị,
‘A ga-adọta Babilọn nʼagha.
Ihere ga-emesịa mee Bel;
otu a kwa, egwu ga-ejupụta Maduk obi.
A ga-eme ka ihere mee oyiyi ya niile a kpụrụ akpụ;
oke egwu ga-ejidekwa arụsị ya niile.’ 3Otu mba, nke si nʼakụkụ ugwu, ga-ebuso ya agha,
mee ala ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya,
nʼihi na mmadụ na anụmanụ ga-esi nʼime ya gbalaga. 4“Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
ndị Izrel na ndị Juda ga-ejikọta onwe ha nʼotu.
Ha niile ga-eji anya mmiri pụọ ịchọ Onyenwe anyị Chineke ha. 5Ha ga-ajụ ajụjụ, banyere ụzọ e si eje Zayọn.
Mgbe ahụ, ha ga-eche ihu ha ijeru nʼebe ahụ.
Ha niile ga-abịakwa were onwe ha nyefee* nʼaka Onyenwe anyị,
nʼime ọgbụgba ndụ ebighị ebi,
nke a na-agaghị echefu echefu. 6“Ndị m akpafuola dịka atụrụ furu efu.
Ndị ọzụzụ atụrụ ha eduhiela ha,
mee ka ha na-awagharị nʼugwu ukwu niile.
Ha na-akpagharị nʼelu ugwu ukwu, ma nʼelu ugwu nta.
Ha echefuokwala ebe izuike nke ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.