Native Bible

Jeremiah 50:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ, gị onye bibiri ihe nketa m, ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka, bee akwa dịka oke ịnyịnya.

Jeremiah 50:11 in English

Jeremiah 50:11 · Berean Standard Bible

“Because you rejoice, because you sing in triumph— you who plunder My inheritance— because you frolic like a heifer treading grain and neigh like stallions,

Context

9Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu, ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha. Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya; ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha. Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba. Ha agaghị agba aka lọta. 10Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha. Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 11“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ, gị onye bibiri ihe nketa m, ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka, bee akwa dịka oke ịnyịnya. 12Ihere ga-eme nne unu, e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu. Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile, bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu. 13Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ, nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam. Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya. Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.