Jeremaya 50:11
Jeremiah 50:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ, gị onye bibiri ihe nketa m, ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka, bee akwa dịka oke ịnyịnya.
Jeremiah 50:11 in English
Jeremiah 50:11 · Berean Standard Bible
“Because you rejoice, because you sing in triumph— you who plunder My inheritance— because you frolic like a heifer treading grain and neigh like stallions,
Context
9Nʼihi na aga m akpali ọtụtụ mba dị ike site nʼala dị nʼugwu,
ndị ga-ejikọta onwe ha ibuso Babilọn agha.
Ha ga-edo onwe ha nʼusoro imegide ya;
ọ bụkwa nʼakụkụ ugwu ka ha ga-esi dọta ya nʼagha.
Àkụ ha ga-agba ga-adị ka àkụ nke onye bụ dike nʼagha na onye ọka ịgba ụta na-agba.
Ha agaghị agba aka lọta. 10Nʼihi nke a, Babilọn ga-aghọ ihe nkwata nʼagha.
Afọ ga-ejukwa ndị niile bụ ndị ga-akwata ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 11“Nʼihi na ị ṅụrịrị ọṅụ nwee obi ụtọ,
gị onye bibiri ihe nketa m,
ị wugharịrị dịka nwa ehi nke na-azọcha ọka,
bee akwa dịka oke ịnyịnya. 12Ihere ga-eme nne unu,
e, a ga-eme ka oke ihere mee nne mụrụ unu.
Ọ ga-abụkwa mba dịkarịsịrị ala nʼetiti mba niile,
bụrụkwa ọzara, ala kpọrọ nkụ na ala uzuzu. 13Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ,
nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam.
Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya.
Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.