Jeremaya 50:15
Jeremiah 50:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile! Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala, a kwatuokwala mgbidi ya niile. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn, bọọnụ ya ọbọ. Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ.
Jeremiah 50:15 in English
Jeremiah 50:15 · Berean Standard Bible
Raise a war cry against her on every side! She has thrown up her hands in surrender; her towers have fallen; her walls are torn down. Since this is the vengeance of the LORD, take out your vengeance upon her; as she has done, do the same to her.
Context
13Nʼihi iwe dị ukwuu nke Onyenwe anyị, ọ dịghị onye ga-ebikwa nʼala Babilọn ọzọ,
nʼihi na a ga-ebibi ya kpamkpam.
Ndị niile si nʼakụkụ ya na-agafe ka ọ ga-eju anya.
Ha ga-akparị ya nʼihi ọnya niile dị ya nʼahụ. 14“Doonụ onwe unu nʼusoro gburugburu obodo Babilọn,
unu ndị niile na-agba ụta.
Gbaanụ ya ụta. Unu echela banyere àkụ ole unu ga-agbapụ
nʼihi na o mehiela megide Onyenwe anyị. 15Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile!
Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala,
a kwatuokwala mgbidi ya niile.
Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn,
bọọnụ ya ọbọ.
Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ. 16Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ
na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi.
Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya,
ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya,
nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu. 17“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị,
nke ọdụm chụsasịrị.
Onye bu ụzọ ripịa ya
bụ eze Asịrịa.
Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya
bụ Nebukadneza, eze Babilọn.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.