Jeremaya 50:17
Jeremiah 50:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị, nke ọdụm chụsasịrị. Onye bu ụzọ ripịa ya bụ eze Asịrịa. Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya bụ Nebukadneza, eze Babilọn.”
Jeremiah 50:17 in English
Jeremiah 50:17 · Berean Standard Bible
Israel is a scattered flock, chased away by lions. The first to devour him was the king of Assyria; the last to crush his bones was Nebuchadnezzar king of Babylon.”
Context
15Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile!
Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala,
a kwatuokwala mgbidi ya niile.
Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn,
bọọnụ ya ọbọ.
Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ. 16Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ
na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi.
Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya,
ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya,
nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu. 17“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị,
nke ọdụm chụsasịrị.
Onye bu ụzọ ripịa ya
bụ eze Asịrịa.
Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya
bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” 18Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,
“Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ,
dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ. 19Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha.
Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan.
Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead
ka afọ ga-ejukwa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.