Native Bible

Jeremiah 50:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị, nke ọdụm chụsasịrị. Onye bu ụzọ ripịa ya bụ eze Asịrịa. Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya bụ Nebukadneza, eze Babilọn.”

Jeremiah 50:17 in English

Jeremiah 50:17 · Berean Standard Bible

Israel is a scattered flock, chased away by lions. The first to devour him was the king of Assyria; the last to crush his bones was Nebuchadnezzar king of Babylon.”

Context

15Kpọọnụ mkpu agha megide ya, site nʼakụkụ niile! Ọ chiliela aka ya elu. Lee, ụlọ elu ya e wusiri ike adaala, a kwatuokwala mgbidi ya niile. Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị na-abọrọ onwe ya ọbọ nʼahụ Babilọn, bọọnụ ya ọbọ. Meenụ ya dịka o si mee ndị ọzọ. 16Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi. Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya, ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya, nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu. 17“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị, nke ọdụm chụsasịrị. Onye bu ụzọ ripịa ya bụ eze Asịrịa. Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” 18Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ, dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ. 19Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha. Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan. Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead ka afọ ga-ejukwa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.