Jeremaya 50:19
Jeremiah 50:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha. Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan. Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead ka afọ ga-ejukwa ha.
Jeremiah 50:19 in English
Jeremiah 50:19 · Berean Standard Bible
I will return Israel to his pasture, and he will graze on Carmel and Bashan; his soul will be satisfied on the hills of Ephraim and Gilead.
Context
17“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị,
nke ọdụm chụsasịrị.
Onye bu ụzọ ripịa ya
bụ eze Asịrịa.
Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya
bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” 18Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,
“Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ,
dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ. 19Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha.
Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan.
Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead
ka afọ ga-ejukwa ha. 20Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel,
ma ọ dịghị nke a ga-achọta.
A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda,
ma o nweghị nke a ga-achọta,
nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha. 21“Busonụ ala Merataim agha,
busokwanụ ndị bi na Pekod agha.
Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.