Jeremaya 50:21
Jeremiah 50:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Busonụ ala Merataim agha, busokwanụ ndị bi na Pekod agha. Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu.
Jeremiah 50:21 in English
Jeremiah 50:21 · Berean Standard Bible
Go up against the land of Merathaim, and against the residents of Pekod. Kill them * and devote them to destruction.* Do all that I have commanded you,” declares the LORD.
Context
19Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha.
Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan.
Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead
ka afọ ga-ejukwa ha. 20Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel,
ma ọ dịghị nke a ga-achọta.
A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda,
ma o nweghị nke a ga-achọta,
nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha. 21“Busonụ ala Merataim agha,
busokwanụ ndị bi na Pekod agha.
Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
“Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu. 22A na-anụ ụzụ agha nʼala ahụ,
a na-anụ ụzụ oke mbibi. 23Lee ka e si gbajie,
ma tipịa mkpirisi igwe ahụ na-esupịa ụwa niile.
Lee ka Babilọn si tọgbọrọ nʼefu
nʼetiti mba niile nke ụwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.