Native Bible

Jeremiah 50:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee ka e si gbajie, ma tipịa mkpirisi igwe ahụ na-esupịa ụwa niile. Lee ka Babilọn si tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile nke ụwa.

Jeremiah 50:23 in English

Jeremiah 50:23 · Berean Standard Bible

How the hammer of the whole earth lies broken and shattered! What a horror Babylon has become among the nations!

Context

21“Busonụ ala Merataim agha, busokwanụ ndị bi na Pekod agha. Chụọ ha ọsọ, gbuchapụ ma bibiekwa ha niile kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Mezuonụ ihe niile m nyere unu nʼiwu. 22A na-anụ ụzụ agha nʼala ahụ, a na-anụ ụzụ oke mbibi. 23Lee ka e si gbajie, ma tipịa mkpirisi igwe ahụ na-esupịa ụwa niile. Lee ka Babilọn si tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile nke ụwa. 24Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn; ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị. A chọtala gị, jidekwa gị, nʼihi na i doola onwe gị ibuso Onyenwe anyị agha. 25Onyenwe anyị emegheela ụlọakụ ngwa agha ya, site nʼime ya wepụta ngwa agha nke ọnụma ya. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nwere ọrụ ọ ga-arụ nʼala Babilọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.