Jeremaya 50:24
Jeremiah 50:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn; ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị. A chọtala gị, jidekwa gị, nʼihi na i doola onwe gị ibuso Onyenwe anyị agha.
Jeremiah 50:24 in English
Jeremiah 50:24 · Berean Standard Bible
I laid a snare for you, O Babylon, and you were caught before you knew it. You were found and captured because you challenged the LORD.
Context
22A na-anụ ụzụ agha nʼala ahụ,
a na-anụ ụzụ oke mbibi. 23Lee ka e si gbajie,
ma tipịa mkpirisi igwe ahụ na-esupịa ụwa niile.
Lee ka Babilọn si tọgbọrọ nʼefu
nʼetiti mba niile nke ụwa. 24Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn;
ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị.
A chọtala gị, jidekwa gị,
nʼihi na i doola onwe gị ibuso Onyenwe anyị agha. 25Onyenwe anyị emegheela ụlọakụ ngwa agha ya,
site nʼime ya wepụta ngwa agha nke ọnụma ya.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
nwere ọrụ ọ ga-arụ nʼala Babilọn. 26Sitenụ nʼebe dị anya bịa buso ya agha.
Kụkapunụ ọba ya niile,
tụkọtanụ ha ọnụ dịka akpa ọka dị ukwuu, nke atụkọtara nʼelu ibe ha.
Bibienụ ya kpamkpam,
ka ihe ọbụla ghakwara ịfọdụrụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.