Jeremaya 50:26
Jeremiah 50:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sitenụ nʼebe dị anya bịa buso ya agha. Kụkapunụ ọba ya niile, tụkọtanụ ha ọnụ dịka akpa ọka dị ukwuu, nke atụkọtara nʼelu ibe ha. Bibienụ ya kpamkpam, ka ihe ọbụla ghakwara ịfọdụrụ ya.
Jeremiah 50:26 in English
Jeremiah 50:26 · Berean Standard Bible
Come against her from the farthest border. Break open her granaries; pile her up like mounds of grain. Devote her to destruction; leave her no survivors.
Context
24Esiiri m gị ọnya, gị Babilọn;
ị makwara nʼọnya ahụ tupu ị mata na ọnya ahụ dị.
A chọtala gị, jidekwa gị,
nʼihi na i doola onwe gị ibuso Onyenwe anyị agha. 25Onyenwe anyị emegheela ụlọakụ ngwa agha ya,
site nʼime ya wepụta ngwa agha nke ọnụma ya.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
nwere ọrụ ọ ga-arụ nʼala Babilọn. 26Sitenụ nʼebe dị anya bịa buso ya agha.
Kụkapunụ ọba ya niile,
tụkọtanụ ha ọnụ dịka akpa ọka dị ukwuu, nke atụkọtara nʼelu ibe ha.
Bibienụ ya kpamkpam,
ka ihe ọbụla ghakwara ịfọdụrụ ya. 27Gbuonụ ụmụ oke ehi ya niile,
ka ha niile gaa nʼebe ụlọ igbu anụ
Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ụbọchị ahụ a kara aka banyere ha abịala,
bụ oge a ga-eji taa ha ahụhụ. 28Geenụ ntị nʼihe ndị na-agbalaga na-ekwu, bụ ndị si na Babilọn na-agbapụ ọsọ.
Ha na-ekwusa na Zayọn
otu Onyenwe anyị Chineke anyị si bọọ ọbọ,
otu o si abọ ọbọ nʼihi ụlọnsọ ukwu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.