Jeremaya 50:18
Jeremiah 50:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ, dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ.
Jeremiah 50:18 in English
Jeremiah 50:18 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the LORD of Hosts, the God of Israel, says: “I will punish the king of Babylon and his land as I punished the king of Assyria.
Context
16Site na Babilọn wezuga onye na-agha mkpụrụ
na onye ji mma owuwe ihe ubi na-ewe ihe ubi.
Ka onye ọbụla laghachikwuru ndị nke ya,
ka onye ọbụla gbalaakwa nʼala nke aka ya,
nʼihi mma agha nke onye na-emegbu emegbu. 17“Izrel dị ka ewu na atụrụ a chụsasịrị achụsasị,
nke ọdụm chụsasịrị.
Onye bu ụzọ ripịa ya
bụ eze Asịrịa.
Onye ikpeazụ gwepịara ọkpụkpụ ya
bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” 18Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,
“Aga m ata eze Babilọn, na ndị ala ya ahụhụ,
dịka m si taa eze Asịrịa ahụhụ. 19Ma aga m akpọghachitekwa Izrel nʼebe ịta nri nke ha.
Ha ga-atakwa nri na Kamel na Bashan.
Ọ bụkwa nʼugwu Ifrem na Gilead
ka afọ ga-ejukwa ha. 20Nʼụbọchị ndị ahụ, ma na mgbe ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“a ga-achọ ajọọ omume nke Izrel,
ma ọ dịghị nke a ga-achọta.
A ga-achọkwa mmehie niile nke Juda,
ma o nweghị nke a ga-achọta,
nʼihi na aga m agbaghara ndị ahụ m mere ka ha fọdụ mmehie ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.