Jeremaya 5:8
Jeremiah 5:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya. Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.
Jeremiah 5:8 in English
Jeremiah 5:8 · Berean Standard Bible
They are well-fed, lusty stallions, each neighing after his neighbor’s wife.
Context
6Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ;
nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha.
Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha
ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta.
Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu,
na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu. 7“Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu?
Lee na ụmụ unu ahapụla m,
na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi.
Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha,
ma ha nọgidere na-akwa iko.
Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ. 8Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya.
Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya. 9Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị,
m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?
M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ
megide mba dị otu a?” 10“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya,
ma unu emebila ya kpamkpam.
Gbajisienụ alaka ya
nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.