Jeremaya 5:7
Jeremiah 5:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu? Lee na ụmụ unu ahapụla m, na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi. Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha, ma ha nọgidere na-akwa iko. Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ.
Jeremiah 5:7 in English
Jeremiah 5:7 · Berean Standard Bible
“Why should I forgive you? Your children have forsaken Me and sworn by gods that are not gods. I satisfied their needs, yet they committed adultery and assembled at the houses of prostitutes.
Context
5Aga m ejekwuru ndị ndu,
gwa ha okwu sị,
nʼezie ha maara ihe gbasara ụzọ Onyenwe anyị,
marakwa iwu niile nke Chineke ha.”
Ma ha onwe ha nʼotu obi agbajiela ịyagba ahụ,
tijiekwa agbụ niile. 6Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ;
nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha.
Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha
ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta.
Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu,
na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu. 7“Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu?
Lee na ụmụ unu ahapụla m,
na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi.
Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha,
ma ha nọgidere na-akwa iko.
Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ. 8Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya.
Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya. 9Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị,
m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?
M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ
megide mba dị otu a?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.