Jeremaya 5:6
Jeremiah 5:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ; nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha. Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta. Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu, na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.
Jeremiah 5:6 in English
Jeremiah 5:6 · Berean Standard Bible
Therefore a lion from the forest will strike them down, a wolf from the desert will ravage them. A leopard will lie in wait near their cities, and everyone who ventures out will be torn to pieces. For their rebellious acts are many, and their unfaithful deeds are numerous.
Context
4Mgbe ahụ, a sịrị, “Ndị a bụ naanị ndị ogbenye
na ndị na-enweghị uche,
ha amaghị ihe ọbụla gbasara ụzọ Onyenwe anyị,
na iwu nke Chineke ha. 5Aga m ejekwuru ndị ndu,
gwa ha okwu sị,
nʼezie ha maara ihe gbasara ụzọ Onyenwe anyị,
marakwa iwu niile nke Chineke ha.”
Ma ha onwe ha nʼotu obi agbajiela ịyagba ahụ,
tijiekwa agbụ niile. 6Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ;
nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha.
Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha
ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta.
Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu,
na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu. 7“Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu?
Lee na ụmụ unu ahapụla m,
na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi.
Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha,
ma ha nọgidere na-akwa iko.
Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ. 8Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya.
Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.