Native Bible

Jeremiah 5:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, a sịrị, “Ndị a bụ naanị ndị ogbenye na ndị na-enweghị uche, ha amaghị ihe ọbụla gbasara ụzọ Onyenwe anyị, na iwu nke Chineke ha.

Jeremiah 5:4 in English

Jeremiah 5:4 · Berean Standard Bible

Then I said, “They are only the poor; they have played the fool, for they do not know the way of the LORD, the justice of their God.

Context

2Ọ bụ ezie, na ha na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ ma ha ka na-aṅụ iyi nʼokwu ụgha.” 3Onyenwe anyị, anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ? Ị tiela ha ihe, ma o metụghị ha nʼahụ. I gwepịara ha, ma ha ekweghị a nabata ịdọ aka na ntị. Ha emeela ka ihu ha sie ike karịa nkume, ha ajụla ịchịgharị. 4Mgbe ahụ, a sịrị, “Ndị a bụ naanị ndị ogbenye na ndị na-enweghị uche, ha amaghị ihe ọbụla gbasara ụzọ Onyenwe anyị, na iwu nke Chineke ha. 5Aga m ejekwuru ndị ndu, gwa ha okwu sị, nʼezie ha maara ihe gbasara ụzọ Onyenwe anyị, marakwa iwu niile nke Chineke ha.” Ma ha onwe ha nʼotu obi agbajiela ịyagba ahụ, tijiekwa agbụ niile. 6Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ; nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha. Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta. Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu, na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.