Jeremaya 5:9
Jeremiah 5:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?”
Jeremiah 5:9 in English
Jeremiah 5:9 · Berean Standard Bible
Should I not punish them for these things?” declares the LORD. “Should I not avenge Myself on such a nation as this?
Context
7“Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu?
Lee na ụmụ unu ahapụla m,
na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi.
Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha,
ma ha nọgidere na-akwa iko.
Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ. 8Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya.
Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya. 9Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị,
m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?
M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ
megide mba dị otu a?” 10“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya,
ma unu emebila ya kpamkpam.
Gbajisienụ alaka ya
nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị. 11Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda
egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.