Jeremaya 5:11
Jeremiah 5:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Jeremiah 5:11 in English
Jeremiah 5:11 · Berean Standard Bible
For the house of Israel and the house of Judah have been utterly unfaithful to Me,” declares the LORD.
Context
9Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị,
m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?
M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ
megide mba dị otu a?” 10“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya,
ma unu emebila ya kpamkpam.
Gbajisienụ alaka ya
nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị. 11Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda
egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 12Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị.
E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme!
Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị;
mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso. 13Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku,
nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha.
Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.