Jeremaya 5:10
Jeremiah 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.
Jeremiah 5:10 in English
Jeremiah 5:10 · Berean Standard Bible
Go up through her vineyards and ravage them, but do not finish them off. Strip off her branches, for they do not belong to the LORD.
Context
8Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya.
Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya. 9Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị,
m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?
M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ
megide mba dị otu a?” 10“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya,
ma unu emebila ya kpamkpam.
Gbajisienụ alaka ya
nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị. 11Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda
egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 12Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị.
E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme!
Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị;
mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.