Jeremaya 49:6
Jeremiah 49:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 49:6 in English
Jeremiah 49:6 · Berean Standard Bible
Yet afterward I will restore the Ammonites from captivity,*” declares the LORD.
Context
4Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu
nke na-amị mkpụrụ hiri nne,
gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi,
onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya,
gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’ 5Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu
mee ka oke egwu bịakwasị gị,”
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya,
“A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu.
Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ. 6“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 7Nke dịrị Edọm:
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman?
Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta?
Amamihe ha o reela ure? 8Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan.
Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi,
nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ,
nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.