Jeremaya 49:5
Jeremiah 49:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu mee ka oke egwu bịakwasị gị,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya, “A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu. Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ.
Jeremiah 49:5 in English
Jeremiah 49:5 · Berean Standard Bible
Behold, I am about to bring terror upon you, declares the Lord GOD of Hosts, from all those around you. You will each be driven headlong, with no one to regather the fugitives.
Context
3“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai!
Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba!
Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ;
gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu,
nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha,
buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ. 4Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu
nke na-amị mkpụrụ hiri nne,
gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi,
onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya,
gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’ 5Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu
mee ka oke egwu bịakwasị gị,”
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya,
“A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu.
Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ. 6“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 7Nke dịrị Edọm:
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman?
Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta?
Amamihe ha o reela ure?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.