Jeremaya 49:4
Jeremiah 49:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu nke na-amị mkpụrụ hiri nne, gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya, gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’
Jeremiah 49:4 in English
Jeremiah 49:4 · Berean Standard Bible
Why do you boast of your valleys— your valleys so fruitful,* O faithless daughter? You trust in your riches and say, ‘Who can come against me?’
Context
2Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha,
nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn.
A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe.
A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa
ndị ahụ niile chụpụrụ ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 3“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai!
Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba!
Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ;
gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu,
nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha,
buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ. 4Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu
nke na-amị mkpụrụ hiri nne,
gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi,
onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya,
gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’ 5Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu
mee ka oke egwu bịakwasị gị,”
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya,
“A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu.
Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ. 6“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.