Jeremaya 49:3
Jeremiah 49:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai! Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba! Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ; gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu, nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha, buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ.
Jeremiah 49:3 in English
Jeremiah 49:3 · Berean Standard Bible
Wail, O Heshbon, for Ai has been destroyed; cry out, O daughters of Rabbah! Put on sackcloth and mourn; run back and forth within your walls, for Milcom will go into exile together with his priests and officials.
Context
1Nke a dịrị ndị Amọn:
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ọ bụ na Izrel enweghị ụmụ ndị ikom?
Izrel o nweghị onye nnweta ihe o nwere?
Gịnị mere Molek ji nweta obodo Gad?
Gịnị mere ndị ya ji bichie obodo ya niile? 2Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha,
nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn.
A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe.
A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa
ndị ahụ niile chụpụrụ ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 3“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai!
Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba!
Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ;
gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu,
nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha,
buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ. 4Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu
nke na-amị mkpụrụ hiri nne,
gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi,
onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya,
gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’ 5Aga m esite nʼaka ndị niile gbara gị gburugburu
mee ka oke egwu bịakwasị gị,”
otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara ya,
“A ga-achụpụ onye ọbụla nʼime unu.
Ọ dịkwaghị onye ga-achịkọta ndị ahụ niile gbapụrụ agbapụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.