Native Bible

Jeremiah 49:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha, nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn. A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe. A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa ndị ahụ niile chụpụrụ ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

Jeremiah 49:2 in English

Jeremiah 49:2 · Berean Standard Bible

Therefore, behold, the days are coming, declares the LORD, when I will sound the battle cry against Rabbah of the Ammonites. It will become a heap of ruins, and its villages will be burned. Then Israel will drive out their dispossessors, says the LORD.

Context

1Nke a dịrị ndị Amọn: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ na Izrel enweghị ụmụ ndị ikom? Izrel o nweghị onye nnweta ihe o nwere? Gịnị mere Molek ji nweta obodo Gad? Gịnị mere ndị ya ji bichie obodo ya niile? 2Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha, nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn. A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe. A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa ndị ahụ niile chụpụrụ ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 3“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai! Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba! Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ; gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu, nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha, buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ. 4Gịnị mere unu ji anya isi nʼihi ndagwurugwu nke na-amị mkpụrụ hiri nne, gị ada nwanyị na-ekwesighị ntụkwasị obi, onye ntụkwasị obi ya dị nʼakụnụba ya, gị onye na-asị, ‘Onye ga-ebuso m agha?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.