Jeremaya 49:8
Jeremiah 49:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan. Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi, nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ, nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ.
Jeremiah 49:8 in English
Jeremiah 49:8 · Berean Standard Bible
Turn and run! Lie low, O dwellers of Dedan, for I will bring disaster on Esau at the time I punish him.
Context
6“Ma mgbe e mesịrị, aga m emekwa ka ndị Amọn laghachikwa nʼala ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 7Nke dịrị Edọm:
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“Ọ pụtara na onye amamihe adịghịkwa na Teman?
Okwu ndụmọdụ ọ gwụla nʼọnụ ndị nwere nghọta?
Amamihe ha o reela ure? 8Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan.
Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi,
nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ,
nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ. 9Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,
ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?
Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị,
ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ? 10Ma aga m agba Ịsọ ọtọ.*
Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile
ka ọ ghara izobe onwe ya.
Ụmụ ya na ndị ikwu ya,*
tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi.
Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.