Jeremaya 49:10
Jeremiah 49:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma aga m agba Ịsọ ọtọ.* Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile ka ọ ghara izobe onwe ya. Ụmụ ya na ndị ikwu ya,* tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi. Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị,
Jeremiah 49:10 in English
Jeremiah 49:10 · Berean Standard Bible
But I will strip Esau bare; I will uncover his hiding places, and he will be unable to conceal himself. His descendants will be destroyed along with his relatives and neighbors, and he will be no more.
Context
8Chigharịanụ gbalaga, unu ndị bi na Dedan.
Gaa zoonụ onwe unu nʼọgba nkume miri emi,
nʼihi na aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị Ịsọ,
nʼoge ahụ m ga-ata ya ahụhụ. 9Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,
ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?
Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị,
ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ? 10Ma aga m agba Ịsọ ọtọ.*
Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile
ka ọ ghara izobe onwe ya.
Ụmụ ya na ndị ikwu ya,*
tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi.
Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị, 11‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ.
Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ” 12Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.