Jeremaya 49:11
Jeremiah 49:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ. Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ”
Jeremiah 49:11 in English
Jeremiah 49:11 · Berean Standard Bible
Abandon your orphans; I will preserve their lives. Let your widows trust in Me.”
Context
9Ọ bụrụ na ndị na-aghọrọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị,
ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?
Ọ bụrụkwa na ndị ohi abịa nʼabalị,
ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-akwakọrọ? 10Ma aga m agba Ịsọ ọtọ.*
Aga m ekpughe ebe nzuzo ya niile
ka ọ ghara izobe onwe ya.
Ụmụ ya na ndị ikwu ya,*
tinyere ndị ya na ha dị na mma na ndị agbataobi ya, ga-ala nʼiyi.
Ya mere, ọ dịghịkwa onye ga-asị, 11‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ.
Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ” 12Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.” 13“Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.