Jeremaya 49:13
Jeremiah 49:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.”
Jeremiah 49:13 in English
Jeremiah 49:13 · Berean Standard Bible
For by Myself I have sworn, declares the LORD, that Bozrah will become a desolation, a disgrace, a ruin, and a curse, and all her cities will be in ruins forever.”
Context
11‘Hapụnụ ụmụ mgbei unu niile, nʼihi na mụ onwe m ga-edebe ha ndụ.
Ndị inyom unu niile ndị di ha nwụrụ nwere ike ịtụkwasị m obi.’ ” 12Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.” 13“Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.” 14Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị.
E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị,
“Chịkọtaanụ onwe, megide ya.
Bilikwanụ maka ibu agha!” 15Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche,
ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.