Jeremaya 49:15
Jeremiah 49:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche, ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ.
Jeremiah 49:15 in English
Jeremiah 49:15 · Berean Standard Bible
“For behold, I will make you small among nations, despised among men.
Context
13“Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.” 14Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị.
E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị,
“Chịkọtaanụ onwe, megide ya.
Bilikwanụ maka ibu agha!” 15Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche,
ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ. 16Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu,
na nganga nke obi gị eduhiela gị,
gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu,
gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya.
A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya,
aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala,
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 17“Edọm ga-aghọ ihe iju anya.
Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya,
ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.