Jeremaya 49:14
Jeremiah 49:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị. E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị, “Chịkọtaanụ onwe, megide ya. Bilikwanụ maka ibu agha!”
Jeremiah 49:14 in English
Jeremiah 49:14 · Berean Standard Bible
I have heard a message from the LORD; an envoy has been sent to the nations: “Assemble yourselves to march against her! Rise up for battle!”
Context
12Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na e mere ka ndị ahụ na-ekwesighị ịṅụ ihe dị nʼiko ahụ ṅụọ ya, a ga-esi aṅaa ghara ịta gị ahụhụ? A ghaghị ịta gị ahụhụ; ị ghakwaghị ịṅụ site nʼiko ahụ.” 13“Eji m onwe m ṅụọ iyi, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, na Bozra ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe ịta ụta, na ihe ịbụ ọnụ. Obodo ya niile ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.” 14Anụla m ozi si nʼọnụ Onyenwe anyị.
E zipụla onyeozi ka ọ ga mba niile dị iche iche zie ha ozi, sị,
“Chịkọtaanụ onwe, megide ya.
Bilikwanụ maka ibu agha!” 15Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche,
ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ. 16Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu,
na nganga nke obi gị eduhiela gị,
gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu,
gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya.
A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya,
aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala,
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.