Native Bible

Jeremiah 49:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Edọm ga-aghọ ihe iju anya. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.

Jeremiah 49:17 in English

Jeremiah 49:17 · Berean Standard Bible

“Edom will become an object of horror. All who pass by will be appalled and will scoff at all her wounds.

Context

15Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche, ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ. 16Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu, na nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu, gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya. A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 17“Edọm ga-aghọ ihe iju anya. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile. 18Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu. Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 19“Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.