Jeremaya 49:17
Jeremiah 49:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Edọm ga-aghọ ihe iju anya. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.
Jeremiah 49:17 in English
Jeremiah 49:17 · Berean Standard Bible
“Edom will become an object of horror. All who pass by will be appalled and will scoff at all her wounds.
Context
15Ugbu a, aga m eme ka ị dị nta nʼetiti mba dị iche iche,
ihe nlelị na-ebe mmadụ nọ. 16Ịdị egwu gị nke na-eyinye ndị mmadụ egwu,
na nganga nke obi gị eduhiela gị,
gị onye na-ebi na mgbawa niile nke nkume dị elu,
gị onye ji ebe niile dị elu nke ugwu nʼaka ya.
A sịkwarị na i wuo akwụ gị nʼebe dị elu, dịka ebe ugo ga-ewu akwụ ya,
aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala,
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 17“Edọm ga-aghọ ihe iju anya.
Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya,
ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile. 18Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,
ya na obodo niile gbara ya gburugburu.
Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 19“Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya,
dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ.
Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya?
Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?
Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.