Jeremaya 49:19
Jeremiah 49:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”
Jeremiah 49:19 in English
Jeremiah 49:19 · Berean Standard Bible
Behold, one will come up like a lion from the thickets of the Jordan to the watered pasture. For in an instant I will chase Edom from her land. Who is the chosen one I will appoint for this? For who is like Me, and who can challenge Me? What shepherd can stand against Me?”
Context
17“Edọm ga-aghọ ihe iju anya.
Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya,
ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile. 18Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra,
ya na obodo niile gbara ya gburugburu.
Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ;
nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 19“Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya,
dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan
na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ.
Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya?
Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu?
Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?” 20Nʼihi nke a, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Edọm,
nụrụkwa ihe o zubere megide ndị bi na Teman.
A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ,
ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a. 21Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha;
iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.